Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 23:18-39

II. SAMUEL 23:18-39 Bible Nso (IGBOB)

Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu. Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu. Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya. Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem; Shama onye Harod, Elika onye Harod; Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa; Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha; Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa; Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin; Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash; Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim; Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan; Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait; Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo; Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab; Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad; Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia; Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta; Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.

II. SAMUEL 23:18-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha. Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ. A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche. Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem Shama, onye Harod, Elika, onye Harod, Helez onye Palti, Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza, onye Anatot, Mebunai, onye Husha, Zalmon, onye Ahohi, Maharai, onye Netofa, Heled, nwa Baana, onye Netofa, Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya, onye Piraton, Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abi-Albon, onye Arba, Azmavet, onye Bahurim Eliaba, onye Shaalbon, Ụmụ Jashen, Jonatan nwa Shama, onye Hara Ahiam, nwa Shara nke Hara, Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo, Hezro, onye Kamel, Paraị, onye Aaba, Igal nwa Netan, onye Zoba, nwa Hagri, Zelek, onye Amọn, Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya, Ira, onye Itra, Gareb, onye Itra na Ụraya, onye Het.