Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ. A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ:
Asahel, nwanne Joab,
Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem
Shama, onye Harod,
Elika, onye Harod,
Helez onye Palti,
Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa,
Abieza, onye Anatot,
Mebunai, onye Husha,
Zalmon, onye Ahohi,
Maharai, onye Netofa,
Heled, nwa Baana, onye Netofa,
Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
Benaya, onye Piraton,
Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
Abi-Albon, onye Arba,
Azmavet, onye Bahurim
Eliaba, onye Shaalbon,
Ụmụ Jashen,
Jonatan nwa Shama, onye Hara
Ahiam, nwa Shara nke Hara,
Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka,
Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,
Hezro, onye Kamel,
Paraị, onye Aaba,
Igal nwa Netan, onye Zoba,
nwa Hagri,
Zelek, onye Amọn,
Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya,
Ira, onye Itra,
Gareb, onye Itra
na Ụraya, onye Het.