Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 8:1-6

II. NDI-EZE 8:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na ONYENWE ANYị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.” Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa. Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya. Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.” Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.” Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.