II. NDI-EZE 21:19-26
II. NDI-EZE 21:19-26 Bible Nso (IGBOB)
Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere. O we je ije n'uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha: o we rapu Jehova, bú Chineke nna-ya-hà, ọ jeghi kwa ije n'uzọ Jehova. Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n'ulo-ya. Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon; ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya. Ma ihe nile nke Emon mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ewe lìe ya n'ílì-ya n'ubi Uza ab͕ara ogige: Josaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
II. NDI-EZE 21:19-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Meshulemet, ada Haruz onye Jotba. O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYị dịka nna ya Manase mere. Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha. Ọ jụrụ iso ONYENWE ANYị, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya. Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya. Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.