Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere. O we je ije n'uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha: o we rapu Jehova, bú Chineke nna-ya-hà, ọ jeghi kwa ije n'uzọ Jehova. Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n'ulo-ya. Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon; ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya. Ma ihe nile nke Emon mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ewe lìe ya n'ílì-ya n'ubi Uza ab͕ara ogige: Josaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
Gụọ II. NDI-EZE 21
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 21
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 21:19-26
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo