Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 20:1-11

II. NDI-EZE 20:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma nwa Emọz bịakwutere ya sị ya, “Otu a ka ONYENWE ANYị sịrị, Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.” Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ, kpee ekpere nye ONYENWE ANYị, sị, “Chetakwa, ONYENWE ANYị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu. Tupu Aịzaya esite nʼetiti ogige ụlọeze pụọ, okwu nke ONYENWE ANYị rutere ya ntị, sị ya: “Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ” Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma. Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na ONYENWE ANYị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?” Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama ONYENWE ANYị nye gị na ONYENWE ANYị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?” Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.” Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ ONYENWE ANYị ka o meere Hezekaya nke a. ONYENWE ANYị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.

II. NDI-EZE 20:1-11 Bible Nso (IGBOB)

Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu. O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku. O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n'etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si, Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova. M'gātukwasi kwa arọ iri na ise n'ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n'ihi Onwem na n'ihi Devid, bú orùm. Aisaia we si, Werenu mbadamba fig. Ha we were ya tukwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, o we diri ndu. Hezekaia we si Aisaia, Gini gābu ihe-iriba-ama na Jehova gēme ka arum di ike, m'we rigorue ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ? Aisaia we si, Nka gāburu gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: onyinyo, ọ̀ gāga n'iru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, ma-ọbu la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri? Hezekaia we si, Ọ di nfe ka onyinyo ruru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri: é-è, kama ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Aisaia, bú onye-amuma, we kpọkue Jehova: O we me ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, nke ọ ridara na nzọ-ukwu ebe-nrigo Ehaz.