Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 19:1-19

II. NDI-EZE 19:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz. Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. Ma eleghị anya ONYENWE ANYị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya ONYENWE ANYị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.” Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya, ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m. Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ” Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha. Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị, “Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’ Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị? Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa? Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?” Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYị, gbasaa ya nʼihu ONYENWE ANYị. Hezekaya kpere ekpere nye ONYENWE ANYị, sị, “O, ONYENWE ANYị, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. Tọọ ntị gị nʼala, o ONYENWE ANYị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ ONYENWE ANYị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ. “Nʼeziokwu, ONYENWE ANYị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu. Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. Ugbu a, ONYENWE ANYị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị ONYENWE ANYị, naanị, bụ Chineke.”

II. NDI-EZE 19:1-19 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e eze, bú Hezakaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova. O we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na ndi-okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia, bú onye-amuma, nwa Emoz. Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha. Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo. Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia. Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum. Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; M'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya. Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka o nēbuso Libna agha: n'ihi na ọ nuru na o siwo na Lekish bulie ije. O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si, Otú a ka unu gāgwa Hezekaia, bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria. Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi? Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa? Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva? Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova. Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa. Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke o jiri zite ya ita Chineke di ndu uta. N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka mba nile na ala nile ha tọb͕ọrọ n'efu, ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku, n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'ihì. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.