II. NDI-EZE 15:1-5
II. NDI-EZE 15:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam nʼIzrel ka Azaraya nwa Amazaya bidoro ịchị dịka eze na Juda. Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem. O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYị. Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. ONYENWE ANYị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.
II. NDI-EZE 15:1-5 Bible Nso (IGBOB)
N'arọ nke-orú-na-asa nke Jeroboam, bú eze Israel, ka Azaraia nwa Amazaia, bú eze Juda, malitere ibu eze. Arọ iri na isi ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ buru eze ọgu arọ abua iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekolaia nke Jerusalem. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere. Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.