Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam nʼIzrel ka Azaraya nwa Amazaya bidoro ịchị dịka eze na Juda. Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem. O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYị. Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. ONYENWE ANYị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.
Gụọ 2 Ndị Eze 15
Geere nke a ntị 2 Ndị Eze 15
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 2 Ndị Eze 15:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo