II. NDI-EZE 13:1-11
II. NDI-EZE 13:1-11 Bible Nso (IGBOB)
N'arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n'aka Hazael, bú eze Siria, na n'aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile. Jehoahaz we chọ ime ka iru Jehova dajua, Jehova we ge ya nti: n'ihi na Ọ huru nmeb͕u Israel, n'ihi na eze Siria meb͕uru ha. (Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga. Otú ọ di, ha esighi na nmehie nile nke ulo Jeroboam wezuga onwe-ha, bú nke o jiri me Israel ka ha mehie, ma Jehoahaz nējeghari nime ya: ọzọ kwa, Ashera guzoro na Sameria.) N'ihi na ọ kweghi ka ndi Israel ọ bula fọduru Jehoahaz, ọ bu nání ọgu ndi-inyinya abua na iri, na ub͕ọ-ala iri, na orú nnù ndikom na nnù ise ndi ji ukwu eje; n'ihi na eze Siria mere ka ha la n'iyì, me kwa ha ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu. Ma okwu Jehoahaz nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ nke ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. N'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya.
II. NDI-EZE 13:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa. Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie. Nʼihi nke a, iwe were ONYENWE ANYị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge. Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYị nʼoge a ka o nyere ya aka, ONYENWE ANYị gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel. ONYENWE ANYị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga. Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria. Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ. Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya. Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.