Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 13:1-11

II. NDI-EZE 13:1-11 IGBOB

N'arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n'aka Hazael, bú eze Siria, na n'aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile. Jehoahaz we chọ ime ka iru Jehova dajua, Jehova we ge ya nti: n'ihi na Ọ huru nmeb͕u Israel, n'ihi na eze Siria meb͕uru ha. (Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga. Otú ọ di, ha esighi na nmehie nile nke ulo Jeroboam wezuga onwe-ha, bú nke o jiri me Israel ka ha mehie, ma Jehoahaz nējeghari nime ya: ọzọ kwa, Ashera guzoro na Sameria.) N'ihi na ọ kweghi ka ndi Israel ọ bula fọduru Jehoahaz, ọ bu nání ọgu ndi-inyinya abua na iri, na ub͕ọ-ala iri, na orú nnù ndikom na nnù ise ndi ji ukwu eje; n'ihi na eze Siria mere ka ha la n'iyì, me kwa ha ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu. Ma okwu Jehoahaz nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ nke ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. N'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya.