II. IHE EMERE 2:1-6
II. IHE EMERE 2:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha ONYENWE ANYị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze. O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa (70,000) na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ (80,000), na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii (3,600). Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya, “Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya. Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke ONYENWE ANYị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi. “Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile. Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?
II. IHE EMERE 2:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Solomon we si na o gēwuru aha Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo. Solomon we guta orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise, bú ndi-ibu, na orú nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù ndikom iteghete ndi edoro ndi-isi-ha. Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a. Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel. Ma ulo nke mu onwem nēwu di uku, n'ihi na Chineke-ayi di uku kari chi nile. Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n'ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m'gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Ya?