Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ihe E Mere 2:1-6

2 Ihe E Mere 2:1-6 BIU

Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha ONYENWE ANYị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze. O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa (70,000) na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ (80,000), na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii (3,600). Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya, “Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya. Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke ONYENWE ANYị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi. “Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile. Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?