II. IHE EMERE 15:1-7
II. IHE EMERE 15:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded. Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. ONYENWE ANYị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya. Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere ONYENWE ANYị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka. Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara. Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha. Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”
II. IHE EMERE 15:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Mọ nke Chineke we dakwasi Azaraia nwa Oded: o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu. Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu: ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya. Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n'ala ahu nile. Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha. Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n'ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu.