Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 15

15
1Mọ nke Chineke we dakwasi Azaraia nwa Oded: 2o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu. 3Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu: 4ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya. 5Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n'ala ahu nile. 6Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha. 7Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n'ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu. 8Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n'ala Juda na Benjamin nile, si kwa n'obodo nile nke ọ naputara n'ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n'iru uzọ-nbata Jehova. 9Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n'etiti ha site n'Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n'ihi na ha siri n'Israel dayere ya n'uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya. 10Ha we chikọta onwe-ha nime Jerusalem n'ọnwa nke-atọ, n'arọ nke-iri-na-ise nke Esa bu eze. 11Ha we chuara Jehova àjà n'ubọchi ahu, site n'ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri. 12Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha; 13na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel. 14Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi. 15Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu. 16Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron. 17Ma esighi n'Israel wezuga ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ubọchi-ya nile. 18Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ. 19Agha adighi kwa ọzọ rue arọ nke-orú-na-iri-na-ise nke Esa bu eze.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye