II. IHE EMERE 14:9-15
II. IHE EMERE 14:9-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha. Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso. Mgbe ahụ, Asa kpọkuru ONYENWE ANYị Chineke ya, si, “ONYENWE ANYị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O ONYENWE ANYị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O ONYENWE ANYị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.” ONYENWE ANYị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ. Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu ONYENWE ANYị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche. Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu ONYENWE ANYị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ. Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.
II. IHE EMERE 14:9-15 Bible Nso (IGBOB)
Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha. Esa we pua izute ya, ha we do agha n'usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha. Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi. Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga. Esa na ndi ya na ha nọ we chua ha rue Gera: ọtutu nime ndi Etiopia we da, idebe-ndu we ghara idiri ha; n'ihi na etipiara ha n'iru Jehova na n'iru ọmuma-ulo-ikwū-Ya; ha we būru ihe-nkwata nke bara uba nke-uku. Ha we tib͕ue obodo nile di Gera buruburu; n'ihi na oké egwu nke Jehova dakwasiri ha: ha we luta ihe obodo nile n'agha; n'ihi na ọtutu ihe-nluta-n'agha di nime ha. Ọzọ kwa, ha tib͕uru ndi ulo-ikwū nke anu-ulo, we chiri n'agha ìgwè ewu na aturu n'uba na camel, lata na Jerusalem.