Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ihe E Mere 14:9-15

2 Ihe E Mere 14:9-15 BIU

Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha. Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso. Mgbe ahụ, Asa kpọkuru ONYENWE ANYị Chineke ya, si, “ONYENWE ANYị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O ONYENWE ANYị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O ONYENWE ANYị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.” ONYENWE ANYị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ. Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu ONYENWE ANYị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche. Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu ONYENWE ANYị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ. Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.