I. NDI TESALỌNAIKA 5:14-22
I. NDI TESALỌNAIKA 5:14-22 Bible Nso (IGBOB)
Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ. Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ. Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile; nēkpenu ekpere nēwepughi aka; nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ. Unu emenyula Mọ Nsọ; unu akpọla ibu-amuma ihe-efu; nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike; unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.
I. NDI TESALỌNAIKA 5:14-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ. Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ. Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ. Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya. Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.