Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ. Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ. Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ. Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya. Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5
Geere nke a ntị 1 Ndị Tesalonaịka 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Tesalonaịka 5:14-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị