Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 8:1-22

I. SAMUEL 8:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel. Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe. Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya, “I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.” Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru ONYENWE ANYị nʼekpere. ONYENWE ANYị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha. Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a. Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.” Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe ONYENWE ANYị kwuru. Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya. Ụfọdụ ka ọ ga-eme ọchịagha, ndị ga-elekọta ọtụtụ puku ndị agha, maọbụ iri ndị agha ise; ndị ụfọdụ ga-abụ ndị ga-akọ ubi ya, ndị ọzọ ga-ewebatakwa ihe owuwe ubi ya, ma ndị ọzọ ga-akpụrụ ya ngwa agha na ihe niile e ji anya ụgbọ agha ya. Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe. Ọ ga-anarakwa unu ubi unu, na ubi vaịnị unu, na ubi oliv unu ndị kachasị mma, were ha nye ndị na-ejere ya ozi. Ọ ga-ewere otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke mkpụrụ ubi unu na ubi vaịnị unu nye ndịisi ọrụ ya na ndị na-ejere ya ozi. Ọ ga-akwagidekwa unu ka unu nye ya ndị ohu unu, ndị ikom nʼime ha, na ndị inyom nʼime ha, ya na anụ ụlọ unu ahụ dị ezi mma, na ịnyịnya ibu unu. Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe anụ ụlọ unu, meekwa ka unu onwe unu bụrụkwa ndị ohu ya. Mgbe ụbọchị ndị ahụ bịara, mgbe ihe ndị a bidoro imezu, unu ga-akwa akwa, rịọọ ka e wezugara unu eze ahụ unu họpụtaara onwe unu, ma ONYENWE ANYị agaghị aṅa unu ntị nʼụbọchị ahụ.” Ma ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị, “Anyị chọrọ eze ga-achị anyị. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.” Samuel gwara ONYENWE ANYị ihe niile ha kwuru. Ma ONYENWE ANYị zara ya ọzọ sị, “Mee ihe ha kwuru, nye ha eze.” Mgbe ahụ, Samuel gwara ndị ikom Izrel okwu sị ha, “Laanụ, nwoke ọbụla nʼobodo ya.”

I. SAMUEL 8:1-22 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel. Ma aha ọkpara-ya bu Joel; aha nwa-ya nwoke nke-abua bu Abaija: ha bu ndi-ikpe nime Bia-sheba. Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé. Ndi-okenye nile nke Israel we chikọta onwe-ha, biakute Samuel rue Rema: ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n'uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile. Ma okwu ahu jọrọ njọ n'anya Samuel, mb͕e ha siri, Nye ayi eze ikpe ayi ikpe. Samuel we kpere Jehova. Jehova we si Samuel, Ge nti olu ndim n'ihe nile ha nāsi gi: n'ihi na ọ bughi gi ka ha juworo, kama ọ bu Mu ka ha juworo, ka M'ghara iburu ha eze. Dika omume nile si di nke ha meworo site n'ubọchi M'mere ka ha si n'Ijipt rigota we rue ta, ha we rapum, fè chi ọzọ òfùfè, otú a ka ha onwe-ha nēme kwa gi. Ma ub͕u a ge nti olu-ha: nání na i gāb͕asiri ha àmà ike, gosi kwa ha ikpé eze ahu nke gābu eze-ha. Samuel we gwa ndi Israel, ndi nāriọ eze n'aka-ya, okwu nile nke Jehova. O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya: o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya. Ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ọ gāchiri ibu ndi nāsugwa ude nēsì ísì utọ, na ibu ndi-odozi-anu, na ibu ndi-osi-ite. Ubi-unu, na ubi-vine-unu, na ubi-olive-unu, bú nke kachasi nma, ka ọ gēwere kwa, nye ndi-orù-ya. Nkpuru-ọghigha-unu na ubi-vine-unu ka ọ gēwere otù uzọ n'uzọ iri, nye ndi nējere ya ozi, nye kwa ndi-orù-ya. Ọ bu kwa ndi-orù-unu ndikom, na ndinyom nējere unu ozi, na umu-okorọbia-unu, bú ndi kachasi nma, na inyinya-ibu-unu, ka ọ gēwere, me ka ha je ozi-ya. Ìgwè ewu na aturu-unu ka ọ gēwere kwa otù uzọ n'uzọ iri: unu onwe-unu gābu-kwa-ra ya orù. Unu gēti kwa nkpu n'ubọchi ahu n'ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n'ubọchi ahu. Ma ndi Israel juru ige nti olu Samuel; ha si, É-è; kama, eze gāchiri ayi; ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n'iru ayi, nēbu kwa agha-ayi. Samuel we nu okwu nile nke ndi Israel, o we kwue ha na nti Jehova. Jehova we si Samuel, Ge nti olu-ha, mere ha eze. Samuel we si ndikom Israel, Lanu, nwoke ọ bula n'obodo-ya.