I. SAMUEL 5:3-4
I. SAMUEL 5:3-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya. Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 5I. SAMUEL 5:3-4 Bible Nso (IGBOB)
Ndi Ashdod we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n'ọnọdu-ya. Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 5