I. SAMUEL 5:1-12
I. SAMUEL 5:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndi Filistia were ib͕e Chineke, ha we si n'Eben-eza bubata ya n'Ashdod. Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n'ulo Degon, dọba ya n'akuku Degon. Ndi Ashdod we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n'ọnọdu-ya. Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya. N'ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n'ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n'Ashdod, rue ta. Aka Jehova we di arọ́ n'aru ndi Ashdod, Ọ we kpochapu ha, were kwa emerod tib͕ue ha, bú Ashdod na ókè-ala-ya nile. Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n'etiti ayi: n'ihi na aka-Ya esikawo ike n'aru ayi na n'aru Degon, bú chi-ayi. Ha we ziga, chikọtara onwe-ha ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Chineke Israel? Ha we si, Ka eburu ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue Gat. Ha we būru ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue ebe ahu. O rue, mb͕e ha būsiri ya buruburu, na aka Jehova digidere obodo ahu n'ọb͕ub͕a-aghara di uku ri nne: Ọ we tib͕ue ndikom obodo ahu, site n'onye ntà we rue onye uku, emerod we b͕apue n'aru ha. Ha we ziga ib͕e Chineke rue Ekron. O rue, mb͕e ib͕e Chineke biaruru Ekron, na ndi Ekron tiri nkpu, si, Ha eburuwo ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu biakute ayi, ime ka ayi na ndi-ayi nwua. Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n'ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n'ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n'obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n'ebe ahu. Ndikom kwa ndi nānwughi, ewere emerod tib͕ue ha: ntiku obodo ahu we rigorue elu-igwe.
I. SAMUEL 5:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd. Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn. Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya. Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ. Ọ bụ nke a mere, site mgbe ahụ ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abata nʼụlọ Dagọn, adịghị azọ ụkwụ ha nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ Dagọn dị nʼAshdọd. Aka ONYENWE ANYị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile. Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.” Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?” Ha zara, “Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat. Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka ONYENWE ANYị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ. Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn. Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!” Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ. Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.