Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 2:1-36

I. SAMUEL 2:1-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYị; nʼime ONYENWE ANYị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. “O nweghị onye dị nsọ dịka ONYENWE ANYị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. “Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. “ONYENWE ANYị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. ONYENWE ANYị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke ONYENWE ANYị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa. Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide ONYENWE ANYị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. ONYENWE ANYị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.” Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka. Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị ONYENWE ANYị anya. Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.” Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.” Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya ONYENWE ANYị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara ONYENWE ANYị anya. Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka ONYENWE ANYị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri ONYENWE ANYị.” ONYENWE ANYị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu ONYENWE ANYị. Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute. Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị ONYENWE ANYị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a? Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị ONYENWE ANYị banyere unu. Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide ONYENWE ANYị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na ONYENWE ANYị na-akwado ịla ha nʼiyi. Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị ONYENWE ANYị na mmadụ mma. Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ. Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m. “Nʼihi ya, otu a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu. Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi. Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị. Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi. “ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị. Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile. Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”

I. SAMUEL 2:1-36 Bible Nso (IGBOB)

Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi. Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova; N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi: Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi. Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu; Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta: N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu, Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume. Anyajiwo uta ndi-dike, Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké. Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri; Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu: Ebe nwanyi àgà muworo umu asa; Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru. Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu: Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota. Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya: Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu. Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha. Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike. Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu; Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe: Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe; Ọ gēnye kwa eze-Ya ike, Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu. Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà. Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova. Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n'ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n'aka-ya; o we dubà ya n'ite ọku, ma-ọbu n'ite isi miri, ma-ọbu n'ite isi anu, ma-ọbu n'ite ọzọ; ihe ọ bula ndudu ahu dulitere ka onye-nchu-àjà nēwere na ya. Otú a ka ha nēme Israel nile n'ime Shailo, bú ndi nābia n'ebe ahu. Ọzọ, tutu ha esure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà biara, si nwoke ahu nke nāchu àjà, Nye anu iruru onye-nchu-àjà; ọ gaghi-anara kwa anu esiri esi n'aka-gi, kama anu ndu. Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n'onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m'gānara ya n'ike. Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova. Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké. Nne-ya we mere ya uwe-nwuda ntà, chigoro ya kwa-arọ, mb͕e o soro di-ya rigo ichu àjà arọ. Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha. N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova. Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile. É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie. Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua Nwa-okoro ahu, bú Samuel, we nētó nāga n'iru, o we di nma, ma n'ebe Jehova nọ, ma n'ebe madu nọ. Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero? Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel? N'ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M'nyeworo n'iwu n'ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n'ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim? N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm. Le, ubọchi nābia, na M'gēbipu ogwe-aka-gi na ogwe-aka ulo nna-gi, na agadi agaghi-adi n'ulo-gi. I gēlegide kwa onye-nkpab͕u n'ebe-obibim, n'ezi ihe nile nke Chineke gēmere Israel: agadi agaghi-adi kwa n'ulo-gi ubọchi nile. Ma nwoke nke diri gi, nke M'nāgaghi-ebipu n'ebe-ichu-àjàm, gābu ime ka anya-gi abua hubìe uzọ, na imekpa nkpuru-obi-gi aru: ọmùmù nile nke ulo-gi gānwu tutu ha erue agadi. Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu. Ma M'gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M'gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n'iru onye nkem etere manu ubọchi nile. Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.