Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Samuel 2:1-36

1 Samuel 2:1-36 BIU

Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYị; nʼime ONYENWE ANYị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. “O nweghị onye dị nsọ dịka ONYENWE ANYị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. “Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. “ONYENWE ANYị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. ONYENWE ANYị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke ONYENWE ANYị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa. Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide ONYENWE ANYị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. ONYENWE ANYị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.” Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka. Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị ONYENWE ANYị anya. Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.” Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.” Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya ONYENWE ANYị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara ONYENWE ANYị anya. Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka ONYENWE ANYị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri ONYENWE ANYị.” ONYENWE ANYị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu ONYENWE ANYị. Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute. Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị ONYENWE ANYị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a? Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị ONYENWE ANYị banyere unu. Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide ONYENWE ANYị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na ONYENWE ANYị na-akwado ịla ha nʼiyi. Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị ONYENWE ANYị na mmadụ mma. Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ. Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m. “Nʼihi ya, otu a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu. Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi. Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị. Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi. “ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị. Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile. Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”