I. SAMUEL 16:7-8
I. SAMUEL 16:7-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ONYENWE ANYị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. ONYENWE ANYị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma ONYENWE ANYị na-ele anya nʼobi.” Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “ONYENWE ANYị ahọrọghị onye a.”
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 16I. SAMUEL 16:7-8 Bible Nso (IGBOB)
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 16