I. SAMUEL 16:1-3
I. SAMUEL 16:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom. Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo. I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te.
I. SAMUEL 16:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Emesịa ONYENWE ANYị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.” Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” ONYENWE ANYị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ ONYENWE ANYị aja.’ Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.”