Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. PITA 4:7-19

I. PITA 4:7-19 Bible Nso (IGBOB)

Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere: nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie: nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu: dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche; ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. Ndi m'huru n'anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n'etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu: kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya. Ọ buru na anāta unu uta n'aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n'ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n'aru unu. N'ihi na, ka onye ọ bula n'etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya: ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n'aha nka. N'ihi na oge ahu eruwo ka esite n'ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n'aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke? Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie? Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.

I. PITA 4:7-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere. Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla. Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi. Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ. Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè. Ọ bụrụ na a na-ekwutọ unu nʼihi aha Kraịst, unu bụ ndị a gọziri agọzi. Nke a na-ezipụta na mmụọ nke ebube ahụ bụ mmụọ Chineke na-ebi nʼime unu. Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike. Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ. Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. Ọ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke? Ma, “Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị onye na-amaghị Chineke na onye mmehie?” Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe.