I. PITA 3:1-4
I. PITA 3:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla, mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ. Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
I. PITA 3:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu; mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu. Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe; kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke.