I. NDI-EZE 9:10-14
I. NDI-EZE 9:10-14 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo abua nime ha, bú ulo Jehova na ulo eze, (ma Hairam, bú eze Taia, were osisi cedar, were kwa osisi fir, were kwa ọla-edo, yere Solomon aka, dika ihe nile si di nke nātọ ya utọ,) na eze Solomon nyere Hairam orú obodo n'ala Galili mb͕e ahu. Hairam we si na Taia puta ihu orú obodo ahu nke Solomon nyere ya; ma ha ezighi ezi n'anya-ya. O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta. Hairam we zigara eze ọgu talent ọla-edo isi.
I. NDI-EZE 9:10-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ ONYENWE ANYị na ụlọeze. Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya. Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya. Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa. Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.