Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ ONYENWE ANYị na ụlọeze. Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya. Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya. Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa. Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
Gụọ 1 Ndị Eze 9
Geere nke a ntị 1 Ndị Eze 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Eze 9:10-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo