I. NDI-EZE 17:2-6
I. NDI-EZE 17:2-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Okwu ONYENWE ANYị rutere Ịlaịja ntị, sị ya, “Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan. Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.” O mere ihe ONYENWE ANYị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ. Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
I. NDI-EZE 17:2-6 Bible Nso (IGBOB)
Okwu Jehova we rue ya nti, si, Si n'ebe a pua, chere onwe-gi iru n'Iru-anyanwu, zo onwe-gi na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. O gēru kwa, na i gāṅu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M'nyeworo iwu izù gi n'ebe ahu. O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. Ugolo-ọma we nēbutere ya achicha na anu n'ututu, na achicha na anu n'anyasi; ọ nāṅu kwa miri sitere na miri-iyi ahu.