Okwu ONYENWE ANYị rutere Ịlaịja ntị, sị ya, “Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan. Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.” O mere ihe ONYENWE ANYị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ. Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
Gụọ 1 Ndị Eze 17
Geere nke a ntị 1 Ndị Eze 17
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Eze 17:2-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị