I. IHE EMERE 18:1-13
I. IHE EMERE 18:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia. Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis. Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha. O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs, ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwara ya ụtụ ịnata ihuọma. ONYENWE ANYị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. Devid chịkọtara ọta ọlaedo nke ndịisi agha Hadadeza na-ebu na Jerusalem. Site na Tibhat nakwa Kun, bụ obodo ndị Hadadeza na-achị, Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu, nke Solomọn ji kpụọ Osimiri bronz ahụ, ogidi niile na ngwongwo ndị ọzọ niile nke e ji bronz kpụọ. Mgbe Tou eze Hamat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile nke Hadadeza, eze Zoba, o zipụrụ Hadoram nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee eze Devid nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Hadoram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaedo, nke ọlaọcha na nke bronz dị iche iche bịa. Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye ONYENWE ANYị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu. O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. ONYENWE ANYị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
I. IHE EMERE 18:1-13 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n'aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya. O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n'akuku osimiri Yufretis. Devid we napu n'aka-ya nnù ub͕ọ-ala abua na ọgu iri, na nnù ndi-inyinya iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha. Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere. Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedareza, chita ha na Jerusalem. Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile. Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba; o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n'ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n'aka Hadoram. Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek. Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise. O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.