Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 18

18
1O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n'aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya. 2O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. 3Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n'akuku osimiri Yufretis. 4Devid we napu n'aka-ya nnù ub͕ọ-ala abua na ọgu iri, na nnù ndi-inyinya iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha. 5Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 6Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere. 7Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedareza, chita ha na Jerusalem. 8Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile. 9Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba; 10o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n'ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n'aka Hadoram. 11Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek. 12Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise. 13O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.
14Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m'ikpe na ezi omume. 15Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta. 16Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ; 17Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'aka eze.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. IHE EMERE 18: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye