I. IHE EMERE 12:20-22
I. IHE EMERE 12:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase. Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha. N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.
I. IHE EMERE 12:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase. Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.