Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ZEKARAIA 12

12
1Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya: 2Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n'aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n'agha ahu agānọchigide Jerusalem. 3Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya. 4N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M'gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M'gēji ikpu-ìsì tib͕ue. 5Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n'obi-ha, Ume m'nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha. 6N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem. 7Jehova gēbu kwa uzọ zọputa ulo-ikwū nile nke Juda, ka ima-nma nke ulo Devid na ima-nma nke ndi bi na Jerusalem we ghara idi uku n'elu Juda. 8N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha. 9Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāchọ ikpochapu mba nile ndi nābia imegide Jerusalem. 10M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu. 11N'ubọchi ahu oké otiti-aka-n'obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n'obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon. 12Ala nka gēti kwa aka n'obi, ab͕uru ọ bula iche; ab͕uru ulo Devid iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ulo Netan iche, na ndinyom-ha iche; 13ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche; 14ab͕uru nile ndi fọduru, ab͕uru ọ bula iche, na ndinyom-ha iche.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ZEKARAIA 12: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye