Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 6

6
1Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo,
Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?
Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru,
Ka ayi we soro gi chọ ya?
2Onye ihe-ya nātọm utọ aridaruwo ubi-ya ab͕ara ogige, rue nkpuru nile nke uda,
Izù ìgwè aturu-ya n'ubi-ya nile ab͕ara ogige, na ichikọta urodi.
3Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, onye ihe-ya nātọm utọ bu kwa nkem:
Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.
4Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza,
I mara nma nke-uku dika Jerusalem,
I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ.
5Wepu anya-gi abua n'irum,
N'ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu.
Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,
Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.
6Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu,
Nke siworo n'isa-aru rigota;
Nke ha nile chi umu abua umu abua,
Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.
7Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu
N'azu ákwà-nkpuchi-gi.
8Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa,
Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu.
9Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè;
Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu;
Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu.
Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma;
E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.
10Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu,
Nke mara nma dika ọnwa,
Nēnwu ka anyanwu,
Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ?
11Rue ubi walnut ab͕ara ogige ka m'ridara,
Ilekwasi akwukwọ ndu nke ndagwurugwu anya,
Ihu ma osisi vine amawo ifuru,
Na ihu ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko.
12Mb͕e m'kāmaghi, nkpuru-obim dorom
N'etiti ub͕ọ-ala nke ndim amara aha-ya.
13Lata, lata, gi nwanyi Shulam;
Lata, lata, ka ayi we lekwasi gi anya.
Gini mere unu gēji lekwasi nwanyi Shulam anya,
Dika ilekwasi otite-egwú nke Mahanaim?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ NKE ABÙ 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye