Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 5:2-16

ABÙ NKE ABÙ 5:2-16 IGBOB

Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta: Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si, Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè: N'ihi na isim juputara n'igirigi, Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali. Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya? Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi? Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ, Afọm we me nkpatu n'ihi ya. Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Akam abua nābusi kwa na myrrh, Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù, N'elu nkpisi nile nke ugodi. Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga. Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu: Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya; Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm. Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum, Ha tirim ihe, b͕uem mma; Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum. Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ, Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu. Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ, Gi onye mara nma n'etiti ndinyom? Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ, Na i b͕awo ayi iyi otú a? Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie, Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise. Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha, Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma. Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi; Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri. Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ: Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù. Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha: Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya. Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha: Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar. Okpu-ọnu-ya tọkarisiri utọ: e, aru-ya nile bu ihe anāchọsi ike. Nka bu onye ihe-ya nātọm utọ, nka bu kwa eyìm, Unu umu-ndinyom Jerusalem.