ABÙ NKE ABÙ 5:2-16
ABÙ NKE ABÙ 5:2-16 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta: Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si, Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè: N'ihi na isim juputara n'igirigi, Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali. Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya? Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi? Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ, Afọm we me nkpatu n'ihi ya. Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Akam abua nābusi kwa na myrrh, Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù, N'elu nkpisi nile nke ugodi. Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga. Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu: Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya; Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm. Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum, Ha tirim ihe, b͕uem mma; Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum. Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ, Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu. Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ, Gi onye mara nma n'etiti ndinyom? Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ, Na i b͕awo ayi iyi otú a? Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie, Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise. Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha, Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma. Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi; Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri. Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ: Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù. Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha: Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya. Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha: Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar. Okpu-ọnu-ya tọkarisiri utọ: e, aru-ya nile bu ihe anāchọsi ike. Nka bu onye ihe-ya nātọm utọ, nka bu kwa eyìm, Unu umu-ndinyom Jerusalem.
ABÙ NKE ABÙ 5:2-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.” Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ? Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike. Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo. Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị. Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ. Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a? Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri. Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma. Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị. Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá. Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma. Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya. Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.