N'ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n'anu-arum: n'ihi na ichọ ihe ọma di nso n'ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n'ebe akam gēru. N'ihi na ezi ihe nke m'nāchọ ka m'nēmegh: kama ihe ọjọ nke m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme. Ma ọ buru na ihe m'nachọghi, ihe ahu ka m'nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie. Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma. N'ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di: ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru. Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n'aru nke ọnwu a? Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.
Gụọ NDI ROM 7
Geere nke a ntị NDI ROM 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 7:18-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị