NDI ROM 7:18-25
NDI ROM 7:18-25 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n'anu-arum: n'ihi na ichọ ihe ọma di nso n'ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n'ebe akam gēru. N'ihi na ezi ihe nke m'nāchọ ka m'nēmegh: kama ihe ọjọ nke m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme. Ma ọ buru na ihe m'nachọghi, ihe ahu ka m'nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie. Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma. N'ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di: ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru. Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n'aru nke ọnwu a? Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.
NDI ROM 7:18-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m. Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme. Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha. Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru. Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m. Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ? Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.