Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 97

97
1Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù;
Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria.
2Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu:
Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.
3Ọku nāga n'iru Ya,
Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu.
4Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:
Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.
5Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova,
N'iru Onye-nwe uwa nile.
6Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,
Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.
7Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,
Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche:
Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.
8Zaion nuru, we ṅuria,
Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;
N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.
9N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile:
Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.
10Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì:
Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya;
Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.
11Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru,
Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.
12Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume;
Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 97: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye