Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi:
Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi.
N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo;
Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha.
Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu,
Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi;
Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike,
M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah
Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova;
Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.
N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova?
Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke?
Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ,
Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu.
Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,
Ònye di ike dika Gi, Ja?
Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.
Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri:
Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.
Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u;
I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.
Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa:
Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.
Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha:
Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.
Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya:
Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.
Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi:
Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.
Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu:
Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.
N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile:
Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu.
N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:
Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.
N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi;
Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.
Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,
Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;
Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.
Achọtawom Devid, bú orùm;
Ewerewom manu nsọm te ya:
Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;
Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.
Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;
Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.
M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,
Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.
Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:
Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.
M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,
Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.
Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,
Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.
Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,
Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.
Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,
Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.
M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,
Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.
Ọ buru na umu-ya arapu iwum,
Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;
Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,
Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;
M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,
Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.
Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,
M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.
M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,
Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.
Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;
M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;
Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,
Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.
Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;
Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah