Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti,
Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu;
Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.
N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi,
Je izọputa ayi.
Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.
Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,
Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?
I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri,
I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.
I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù:
Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha.
Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;
Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.
I si n'Ijipt ropu osisi vine:
I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.
I doziri ọnọdu n'iru ya,
O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.
Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,
Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.
Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,
Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.
N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,
Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?
Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya,
Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.
Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:
Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,
Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo,
Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume.
Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya:
Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì.
Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi,
N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.
Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu:
Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.
Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;
Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.