Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 75

75
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma Esaf, Abù.
1Ayi ekelewo Gi, Chineke;
Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso:
Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
2Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà,
Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi.
3Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu:
Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah
4Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi:
Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu:
5Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu;
Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.
6N'ihi na ọ bughi n'Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n'Ọdida-anyanwu,
Ọ bughi kwa n'ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia.
7Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.
8N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu;
O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya:
N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.
9Ma mu onwem, m'gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi,
M'gābùku Chineke nke Jekob abù ọma.
10Ọzọ, mpi nile nke ndi nēmebi iwu ka m'gēbipu;
Ma agēbuli mpi nile nke onye ezi omume.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 75: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye