Ayi ekelewo Gi, Chineke; Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso: Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile. Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà, Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi. Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu: Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi: Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu: Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu; Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu. N'ihi na ọ bughi n'Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n'Ọdida-anyanwu, Ọ bughi kwa n'ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia. Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu. N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu; O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya: N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua. Ma mu onwem, m'gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, M'gābùku Chineke nke Jekob abù ọma. Ọzọ, mpi nile nke ndi nēmebi iwu ka m'gēbipu; Ma agēbuli mpi nile nke onye ezi omume.
Gụọ ABÙ ỌMA 75
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 75
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 75:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị