Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo:
Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:
Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,
Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.
Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;
Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;
Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ;
(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)
Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;
Ka ọ zọda kwa ndum n'ala,
Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah
Bilie, Jehova, n'iwe-Gi,
Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:
Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.
Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu:
Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya.
Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:
Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.
Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:
N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.
Ọtam dikwasi na Chineke,
Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.
Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,
Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.
Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;
Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.
Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;
Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.
Le, ime ajọ ihe nēme ya;
Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.
Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,
O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme.
Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya,
Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.
M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di:
M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.