Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 7:1-17

ABÙ ỌMA 7:1-17 Bible Nso (IGBOB)

Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo: Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha: Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum, Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi. Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka; Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua; Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:) Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru; Ka ọ zọda kwa ndum n'ala, Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah Bilie, Jehova, n'iwe-Gi, Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um: Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu. Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu: Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya. Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe: Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem. Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu. Ọtam dikwasi na Chineke, Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi. Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume, Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi. Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ; Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a. Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu; Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku. Le, ime ajọ ihe nēme ya; Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha. Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya, O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme. Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya, Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi. M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di: M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.

ABÙ ỌMA 7:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ, ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. O ONYENWE ANYị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha. Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela Bilie, ONYENWE ANYị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi. Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha. Ka ONYENWE ANYị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O ONYENWE ANYị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike. Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi. Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya. Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ. Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta. Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru. Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi. Aga m enye ONYENWE ANYị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha ONYENWE ANYị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.