Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 68

68
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid, Abù.
1Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa;
Ka ndi nākpọ Ya asì si n'iru Ya b͕alaga.
2Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha:
Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku,
Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì.
3Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke:
E, ka ha wulie elu n'ọṅù.
4Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma:
Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi;
Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya.
5Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru,
Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ.
6Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo:
Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma:
Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku.
7Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi,
Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah
8Ala mara jijiji,
Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke:
Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel.
9Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke,
Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike.
10Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:
I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke.
11Onye-nwe-ayi nēnye okwu:
Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.
12Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga:
Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha.
13Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu,
Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie,
Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua.
14Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,
Snow nēzò na Zalmon.
15Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu;
Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu.
16Unu ugwu nwere ugwu n'elu unu, n'ìhi gini ka unu ji ekworo
Le ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya?
E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi.
17Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu:
Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya.
18I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha;
I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu,
E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha.
19Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu,
Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah
20Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa;
Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua.
21Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya,
Bú opu-n'isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n'ikpe-ọmuma-ya.
22Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata,
M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata:
23Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara,
Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.
24Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke,
Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya.
25Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu,
N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.
26Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke,
Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel.
27N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha,
Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha,
Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.
28Chineke-gi enyewo ike-gi iwu:
Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.
29N'ihi ulo uku Gi nime Jerusalem
Ọ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.
30Basiere anu-ọhia nke amì nba ike,
Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche,
Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha;
Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.
31Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta;
Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.
32Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù;
Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma; Selah
33Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya;
Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.
34Nyenu Chineke ike:
N'elu Israel ka idi-elu-Ya di,
Ike-ya di kwa na mbara-ígwé nile.
35Onye anātu egwu ka Chineke bu site n'ebe nsọ Gi nile:
Chineke nke Israel, Ya onwe-ya nēnye ndi-Ya ike na ume.
Onye agọziri agọzi ka Chineke bu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 68: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye