Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu; Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu. Unu ugwu nwere ugwu n'elu unu, n'ìhi gini ka unu ji ekworo Le ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya? E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi. Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya. I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha; I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu, E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha. Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu, Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa; Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua.
Gụọ ABÙ ỌMA 68
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 68
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 68:15-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo